Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.
Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.
Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.
N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya, Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya: Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche, Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.