Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 43:2 - Bible Nso

2 Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,

See the chapter Copy




Jeremaya 43:2
31 Cross References  

Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n'ebe a pua; n'ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n'anya di umu-ya.


Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel.


I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie.


Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ, Na ire nke nēkwu oké ihe:


Afọ ejuwo nkpuru-obi-ayi ri nne N'ichì-ọchì nke ndi nọ jū, Na nleda nke ndi-npako.


Fero we si, Ònye bu Jehova, na m'gēge nti n'olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m'gaghi-ezipu Israel.


Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha?


Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu: Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;


Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.


ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.


Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n'Iarael.


Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n'obi: n'ihi na Jehova ekwuwo.


Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.


ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.


Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we chiri ndi Israel nile fọduru, bú ndi o mere ka ha si n'aka Ishmael nwa Netanaia lata, site na Mizpa, mb͕e o tib͕usiri Gedalaia nwa Ahaikam, bú ndikom, ndi bu ndi-agha, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-onozi, ndi o mere ka ha si na Gibeon lata:


n'ihi ndi Kaldea: n'ihi na ha turu egwu ha, n'ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.


Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso,


N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:


Ndi ahu we si Jeremaia, Ka Jehova buru onye-àmà nēkwu ezi-okwu nke kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi n'etiti ayi, ọ buru na ọ bughi dika okwu ahu nile si di, nke Jehova, bú Chineke-gi, gēzite gi ka i were ya biakute ayi, otú a ka ayi gēme.


O rue, mb͕e Jeremaia gwabìri ndi Israel nile okwu nile nke Jehova, bú Chineke-ha, nke Jehova, bú Chineke-ha, zigara ya ka o were ha jekuru ha, bú okwu ndia nile,


Okwu ahu nke i gwaworo ayi n'aha Jehova, ayi agaghi-adi nēge gi nti.


Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Follow us:

Advertisements


Advertisements