Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 42:6 - Bible Nso

6 Ma ọ di nma ma ọ jọrọ njọ, olu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēge nti, bú Onye ayi onwe-ayi nēziga gi ijekuru; ka o we diri ayi nma, mb͕e ayi nēge nti olu Jehova, bú Chineke-ayi.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”

See the chapter Copy




Jeremaya 42:6
16 Cross References  

N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri: Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma.


Ha we ji ọnu-ha nārà Ya, Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.


Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa.


Sinu onye ezi omume, na ọ gādiri ya nma: n'ihi na nkpuru omume-ha nile ka ha gēri.


Ì gābu eze, n'ihi na gi onwe-gi nānu ọku n'obi ika ndi ọzọ n'iji osisi cedar ewu ulo? nna-gi, ò righi ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume? mb͕e ahu ka ọ diri ya nma.


Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na ndi Israel nile, we ghara ige nti olu Jehova, ibi n'ala Juda.


kama ọ bu okwu a ka M'nyere ha n'iwu, si, Genu nti olum, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi: je-kwa-nu ije n'uzọ nile nke M'nēnye unu n'iwu, ka o we diri unu nma.


Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne.


Gini ka ayi gēkwu kwa? Ìwu ahu bu nmehie? Chineke ekwela. Kama, m'gaghi-amawori nmehie, ma ọ buru na esiteghm n'aka iwu mara ya: n'ihi na m'gaghi-amatawori agu ihe ọjọ, ma ọ buru na iwu ahu asighi, Agu ihe ọjọ agula gi:


n'ihi na itukwasi uche n'anu-aru, ya na Chineke di n'iro; n'ihi na edoghi ya n'okpuru iwu Chineke, n'ihi na apughi kwa ido ya n'okpuru ya:


Gi onwe-gi jerue nso, nu kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gēkwu: gi onwe-gi gāgwa kwa ayi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāgwa gi; ayi gānu kwa, me ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!


N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta.


Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.


Follow us:

Advertisements


Advertisements