Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 41:10 - Bible Nso

10 Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.

See the chapter Copy




Jeremaya 41:10
13 Cross References  

Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.


Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide?


Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.


Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku.


Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia nime Ribla n'anya-ya: ọ bu kwa ndi nile nke Juda amara aha-ha ka eze Babilon b͕uru.


si ya, Ì mara n'ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru.


Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon;


Follow us:

Advertisements


Advertisements