Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 40:8 - Bible Nso

8 ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.

See the chapter Copy




Jeremaya 40:8
29 Cross References  

Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.


Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia.


Elifelet nwa Ahasbai, nwa onye Meakat, Eliam nwa Ahitofel onye Gailo;


Ndi-isi nile nke usu-ndi-agha nile, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia onye-nlekọta, ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan nwa Karca, na Seraia nwa Tanhumet onye Netofa, na Jaazanaia nwa onye Meakat, ha onwe-ha na ndikom-ha.


O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.


Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa;


Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana.


Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra.


ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:


Ndikom Netofa, ọgu abua na iri na isi.


Ndikom Bet-lehem na Netofa, ọgu iteghete na asatọ.


Ndi-isi we wesa Jeremaia iwe, tie ya ihe, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ulo Jonatan ode-akwukwọ; n'ihi na ulo ahu ka ha mereri ulo-nkpọrọ.


Ma ub͕u a, biko, nuru, onye-nwem, eze: biko, ka aririọ-amaram da n'iru gi; eme-kwa-la ka m'laghachi n'ulo Jonatan, bú ode-akwukwọ, ka m'we ghara inwu n'ebe ahu.


i gāsi kwa ha, Mu onwem nēme ka aririọ-amaram da n'iru eze, ka ọ ghara ime ka m'laghachi n'ulo Jonatan, inwu n'ebe ahu.


Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;


Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa,


si ya, Ì mara n'ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru.


Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m'je, m'gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n'ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n'ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n'iyì?


Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.


O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, onye bu kwa otù nime ndi-isi nke eze, ya na-ndikom iri, biakutere Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa; ha we rikọ nri n'ebe ahu na Mizpa.


Johanan nwa Karea na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya we nu ihe ọjọ ahu nile nke Ishmael nwa Netanaia mere,


Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.


Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, na Johanan nwa Karea, na Jezanaia nwa Hoshaia, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, we biarue nso,


O we kpọ Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha so ya, na ndi Israel nile site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku,


Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:


Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n'ala Juda;


Jaia nwa Manase were akuku Agob nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat; ọ we kpọ ha Beshan-havot-jaia, n'aha-ya, rue ta.)


nāchi kwa n'ugwu Heamon, na nime Saleka, na nime Beshan nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na nkera Gilead, bú ókè-ala Saihon, bú eze Heshbon.


Follow us:

Advertisements


Advertisements