Jeremaya 40:7 - Bible Nso7 Ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, ha onwe-ha na ndikom-ha, we nu na eze Babilon mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta n'ala-ha, na o me-kwa-ra ya onye-nlekọta nke ndikom na ndinyom na umu-ntakiri, bú ufọdu nime ndi nēnweghi ike n'ala, nime ndi anēmeghi ka ha je biri na Babilon; See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ, See the chapter |