Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 40:12 - Bible Nso

12 ndi-Ju nile we si n'ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n'ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.

See the chapter Copy




Jeremaya 40:12
8 Cross References  

Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile.


N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo.


Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.


Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa,


Ishmael we dọta ndi Israel nile fọduru ndi nọ na Mizpa n'agha, bú umu-ndinyom eze, na ndi Israel nile fọduru na Mizpa, ndi Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere Gedalaia nwa Ahaikam onye-nlekọta-ha: Ishmael nwa Netanaia we dọta ha n'agha, je igabigakuru umu Amon.


Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha, we chiri ndi Juda nile fọduru, bú ndi siri na mba nile ebe achugara ha-ri lata inọ dika ọbìa n'ala Juda;


Ma site na mb͕e ayi rapuru isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nile akọwọ ayi, ọ bu kwa site na mma-agha na site n'oké unwu ka emeworo ka ayi gwusia.


Ìgwè ewu na aturu nkem nākpafu n'ugwu nile, na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu: ọ bu kwa n'elu uwa nile ka ìgwè ewu na aturu nkem b͕asara: ọ dighi kwa onye nāju ajuju bayere ha, ọ dighi kwa onye nāchọ ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements