Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 4:6 - Bible Nso

6 Bulienu ọkọlọtọ n'uzọ Zaion: latanu n'ulo ọsọsọ, unu eguzola: n'ihi na ihe ọjọ ka Mu onwem nēme ka o si n'Ugwu bia, ya na ntipia uku.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.”

See the chapter Copy




Jeremaya 4:6
19 Cross References  

Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche.


Ge nti olu nke ihe anuru, le, ọ nābia, oké ùzù agha nēsi kwa n'ala Ugwu bia, ime ka obodo nile nke Juda ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-obibi nke nkita-ọhia.


Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.


Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.


M'gēdo kwa ndi-nbibi nsọ imegide gi, onye ọ bula na ihe-agha-ya: ha gēb͕utu kwa osisi cedar gi nile kachasi nma, me ka ha dakwasi n'ọku.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


Rùe ole mb͕e ka m'gāhu ọkọlọtọ, nu olu opì-ike?


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


Olu agha di n'ala nka, na olu ntipia uku.


Bulienu ọkọlọtọ n'ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n'ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon.


Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.


Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea!


Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.


Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n'ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.


O we kpọ òkù na ntim abua n'oké olu, si, Bianu nso, unu ndi-nlekọta nke obodo, onye ọ bula ya jide kwa ihe o ji bibi madu n'aka-ya.


Ma, le, ndikom isi nēsi n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama di n'elu, nke nēche iru n'Ugwu, bia, onye ọ bula nējide kwa anyu-ike-agha-ya n'aka-ya; otù nwoke ọzọ di kwa n'etiti ha nke yiri uwe ọcha, mpi ink nke ode-akwukwọ di kwa n'úkwù-ya. Ha we ba, guzo n'akuku ebe-ichu-àjà nke ọla.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na olu iti-nkpu gēsi n'ọnu-uzọ-ama azù da, ya na ikwasi-ákwá-ike site n'obodo nke-abua, na oké ntiwa site n'ugwu ntà nile.


Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida.


Follow us:

Advertisements


Advertisements