Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 4:24 - Bible Nso

24 Ahurum ugwu, ma, le, ha nāma jijiji, ugwu ntà nile me-kwa-ra nkapatu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.

See the chapter Copy




Jeremaya 4:24
19 Cross References  

Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu:


Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.


Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu; Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.


Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.


Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.


N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku.


Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n'aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ.


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.


Site na Dan ka anuru ima-imi nke inyinya-ya nile: site n'olu ọbube nile nke inyinya-ya nile di ike ala nka nile amawo jijiji; ha we bia richapu ala na ùjú-ya; obodo na ndi bi nime ya.


Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.


azù nile nke oké osimiri, na anu-ufe nke elu-igwe, na anu ọhia, na ihe nile nke nākpu akpu, bú nke nākpu akpu n'ala, na madu nile ndi nọ n'elu uwa, ewe me nkpatu site n'irum, agākwatu kwa ugwu nile, ebe nile di nkputankpu gāda kwa, mb͕idi nile ọ bula gādaru kwa ala.


Ugwu nile gāb͕aze kwa n'okpuru Ya, agāb͕awa kwa ndagwurugwu nile, dika wax n'iru ọku, dika miri nke anāwuda n'ebe-nrida.


Ugwu nile huru Gi, we nāb͕ali; Okè miri-ozuzo gabigara: Ob͕u-miri mere ka olu-ya da, Chilie aka-ya elu.


O guzoro, we tùa uwa; O lere anya, we me ka mba nile kuja: Ewe tipia ugwu nile di mb͕e ebighi-ebi, Ugwu ntà ebighi-ebi nile ruru ala; Ojije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga bu nke Ya.


Ewe kewapu elu-igwe dika akwukwọ-odide mb͕e anāpiakọta ya; ewe wepu ugwu nile na agwe-etiti nile ọ bula n'ọnọdu-ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements