Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 4:17 - Bible Nso

17 Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

See the chapter Copy




Jeremaya 4:17
16 Cross References  

Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.


Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.


Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche.


N'ihi na ndi nke nānupu isi ka ọ bu, umu nēkwu okwu-ugha, umu nēkweghi inu iwu Jehova:


Ma ndi nka nwere obi nēwezuga onwe-ya nānupu kwa isi; ha ewezugawo onwe-ha, we la.


O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadreza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ha we ma ulo-ikwū-ha megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.


Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide: Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um: Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.


Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.


Ndi nānupu isi ka unu bu n'ebe Jehova nọ site n'ubọchi m'mara unu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements