Jeremaya 39:5 - Bible Nso5 Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n'azu; rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n'ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe. See the chapter |
Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.