Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 38:9 - Bible Nso

9 Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n'ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n'olùlù ahu; o we nọ n'ọnwu n'ọnọdu-ya n'ihi oké unwu: n'ihi na nri adighi kwa ọzọ n'obodo a.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Onyenwe m eze, lee na mmeso ndị a mesoro Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha atụbala ya nʼime olulu mmiri hapụ ya ka ọ nọdụ nʼebe ahụ nwụọ nʼihi agụụ mgbe achịcha kọrọ nʼobodo.”

See the chapter Copy




Jeremaya 38:9
12 Cross References  

N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba, Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ, M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-


M'gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha.


Eze, bú Zedekaia, we nye iwu, ha we tiye Jeremaia n'ogige ulo-nche, nēnye ya otù ob͕e achicha kwa-ubọchi site n'èzí ndi-osi-ite, rue mb͕e achicha nile nke di n'obodo gwusiri. Jeremaia we nọgide n'ulo-nche.


Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n'ebe a chiri orú ndikom na iri n'aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n'olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua.


Ebed-melek we si n'ulo eze puta, gwa eze okwu, si,


Ma M'gānaputa gi ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): agaghi-enye kwa gi n'aka ndi ahu gi onwe-gi nātu egwu ha.


N'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri; Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi: Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.


Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.


Follow us:

Advertisements


Advertisements