Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 34:2 - Bible Nso

2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ.

See the chapter Copy




Jeremaya 34:2
14 Cross References  

O rue, n'arọ nke-iteghete nke ọ bu eze, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, na Nebukadneza, bú eze Babilon, biara, ya onwe-ya na usu-ndi-agha-ya nile, imegide Jerusalem, ọ ma ulo-ikwū megide ya; ha we wue ulo-agha imegide ya buruburu.


o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.


N'ihi na edowom irum n'aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n'ọku.


Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a.


na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.


N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;


Le, M'gaje inye iwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me ka ha biaghachi n'obodo a; ha gēbuso kwa ya agha, were ya, sure ya n'ọku: ọ bu kwa obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku.


Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n'ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.


Follow us:

Advertisements


Advertisements