Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 34:1 - Bible Nso

1 Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị,

See the chapter Copy




Jeremaya 34:1
14 Cross References  

N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.


Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova n'arọ nke-iri nke Zedekaia, bú eze Juda, nke bu arọ nke-iri-na-asatọ nke Nbukadreza.


Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda.


mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.


Nebukadneza, bú eze, nēzigara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ozi, bú ndi bi n'uwa nka nile; ka udo bara unu uba.


gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n'ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n'elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa.


ọ bu kwa n'ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n'iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala.


Follow us:

Advertisements


Advertisements