Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 33:9 - Bible Nso

9 Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n'ihi ezi ihe ahu nile na n'ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’

See the chapter Copy




Jeremaya 33:9
40 Cross References  

Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha.


O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a.


N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.


Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di, Ka ewe tua egwu Gi.


Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi: Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.


ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.


Nọnọdu ogwu osisi fir gētolite, ọ bu kwa n'ọnọdu nke ka osisi myrtle gētolite: o we ghọrọ Jehova aha, ghọ-kwa-ra Ya ihe-iriba-ama ebighi-ebi nke anāgaghi-ebipu ya.


Mb͕e ahu i gāhu we nwue enwu, obi-gi gātu kwa oké egwu, sa mbara; n'ihi na agēchigharikute gi ihe bara uba nke oké osimiri, àkù nke mba di iche iche gābiakute gi.


N'ihi Zaion m'gaghi-edebe ọnum du, na n'ihi Jerusalem m'gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu.


Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.


Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.


unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n'uwa.


dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n'iru Gi ma jijiji.


N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.


Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n'ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara.


N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.


M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.


Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:


Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha.


Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu.


M'gēme kwa ka afọ abuba jubiga nkpuru-obi ndi-nchu-àjà ókè, afọ ezi ihem gēju kwa ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ezi okwu ahu guzosie ike, bú nke M'gwaworo ulo Israel, nke M'kwuwo-kwa-ra bayere ulo Juda.


i gāṅu kwa iyi, Jehova nādi ndu, n'ezi-okwu, na n'ikpé ziri ezi, na n'ezi omume; mba nile gāgọzi kwa onwe-ha nime Ya, ọ bu kwa nime Ya ka ha gānya isi.


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


Èsi aṅa ghara irapu obodo nke otuto, bú obodo nke obi-utọm?


M'gēme kwa ka i rida, gi na ndi nārida n'olùlù, ijekuru ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, M'gēme kwa ka i bi n'ala di n'okpuru uwa, n'ebe di nkpọnkpọ site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, gi na ndi nārida n'olùlù, ka madu we ghara ibi nime gi; M'gētiye kwa ima-nma n'ala ndi di ndu:


Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n'efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n'efu, nke akwaturu n'ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha.


E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Kpọsa ọzọ, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obodom nile gēsite n'ezi ihe b͕asa ọzọ; Jehova gākasi kwa Zaion obi ọzọ, rọputa Jerusalem ọzọ.


Le, Mu onwem gaje ime Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche ndi di ya buruburu ọkwa nṅaghari, ọ bu kwa n'aru Juda ka ọ gādi nime nnọchigide-n'agha ahu agānọchigide Jerusalem.


Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n'ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà.


Follow us:

Advertisements


Advertisements