Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 32:12 - Bible Nso

12 m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 nyefee ha nʼaka Baruk nwa Neraya, nwa Mahseia, nʼihu Hanamel nwanna m, na nʼihu ndị akaebe ndị ọzọ, ndị aka ha dị nʼakwụkwọ ahụ, na nʼihu ndị Juu ndị ọzọ, ndị nọ nʼogige ụlọ ndị agha ahụ.

See the chapter Copy




Jeremaya 32:12
10 Cross References  

M'we nye Beruk iwu n'anya ha, si,


M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,


Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.


Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n'ọnu Jeremaia n'elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n'ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n'elu ha ọtutu okwu dika ha.


Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere Seraia nwa Neraia, nwa Mahseia, n'iwu, mb͕e o soro Zedekaia, bú eze Juda, je Babilon n'arọ nke-anọ nke ọbubu-eze-ya. Ma Seraia bu onye-isi idozi ebe-izu-ike nke eze.


n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa.


Follow us:

Advertisements


Advertisements