Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 31:34 - Bible Nso

34 ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n'ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gāb͕aghara ajọ omume-ha, M'gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

See the chapter Copy




Jeremaya 31:34
42 Cross References  

Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.


Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


Ndi nākpafu na mọ-ha gāma kwa nghọta, ndi-ntamu gāmuta kwa ihe-nmuta.


Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n'ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n'otiti-ya.


Onye-obibi-ya agaghi-asi, Anamaria ọria: agēbupu ajọ omume nke ndi bi nime ya.


Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya.


Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo: Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam: N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


N'ihi nka ka ndim gāmara aham: n'ihi nka ka ha gāmara n'ubọchi ahu na Mu onwem bu Onye ahu Nke nēkwu okwu; lekwam.


Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.


M'gēnye kwa ha obi imaram, na Mu onwem bu Jehova: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: n'ihi na ha gēji obi-ha nile laghachikutem.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.


M'gēme kwa ka ha si n'ajọ omume nile ha, bú nke ha mehieworo megidem, di ọcha; M'gāb͕aghara kwa ha ajọ omume-ha nile nke ha mehieworo megidem, na nke ha jehieworo megidem n'ime ha.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


M'gēkwere kwa ilu gi n'Onwem n'ikwesi-ntukwasi-obi: i we mara, Jehova.


Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.


Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.


N'ihi na uwa gējuputa n'ọmuma ebube Jehova, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie nile ha,


Ma nka bu ndu ebighi-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke nání Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere, bú Jisus Kraist.


Emerem ka aha-Gi puta ìhè nye ndi I nyerem site 'uwa: Gi onwe-gi nwere ha, I were kwa ha nyem; ha edebewo kwa okwu-Gi.


Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.


Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n'aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie.


Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist;


N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist.


Onye ayi sitere n'ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di,


Ma ọ dighi unu nkpà ka madu degara unu akwukwọ bayere ihunanya n'ebe umu-nna-unu nọ: n'ihi na unu onwe-unu bu ndi Chineke zíworo ihurita ibe-unu n'anya;


N'ihi na mb͕e unu kwesiri ibu ndi-ozizí n'ihi oge, ọ di unu nkpà ọzọ ka madu zí unu ihe bu ihe-ozizí mbu nke nmalite okwu si n'ọnu Chineke puta; unu aghọwo kwa ndi miri-ara di nkpà, ọ bughi nri siri ike.


Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya, Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi: N'ihi na ha nile gāmatam, Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.


N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.


Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n'Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.


Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.


Ma ayi matara na Ọkpara Chineke abiawo, nye kwa ayi uche, ka ayi we mara Onye-ezi-okwu ahu, ayi nọ kwa nime Onye-ezi-okwu ahu, nime Ọkpara-Ya, bú Jisus Kraist. Nka bu ezi Chineke, na ndu ebighi-ebi.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Follow us:

Advertisements


Advertisements