Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 30:2 - Bible Nso

2 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, Dere onwe-gi n'akwukwọ okwu nile nke M'gwaworo gi.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Dee ihe niile m gwara gị nʼime akwụkwọ.

See the chapter Copy




Jeremaya 30:2
19 Cross References  

Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


Ub͕u a, bata, dekwasi ya na mbadamba íhe n'etiti ha, kà kwa ya n'akwukwọ, ka o we diri ubọchi ọdi-n'iru rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Jehova we sim, Were n'onwe-gi otù oké mbadamba ihe, ji kwa ihe madu ji ede ihe-odide dekwasi ya, Nka diri Maha-shalal-hash-baz;


M'gēme kwa ka okwum nile biakwasi ala ahu, bú okwu nke M'kwuworo megide ya, bú amuma nile edeworo n'akwukwọ a, nke Jeremaia buworo megide mba nile.


Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,


Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.


Ma Jeremaia were akwukwọ-npiakọta ọzọ nye Beruk nwa Neraia, bú ode-akwukwọ; o we dere n'ọnu Jeremaia n'elu ya okwu nile nke akwukwọ ahu nke Jehoiakim, bú eze Juda, surereri n'ọku; ọzọ kwa, atukwasiri n'elu ha ọtutu okwu dika ha.


Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba.


N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.


Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.


Ma ub͕u a, Derenu onwe-unu abù a, gi zí kwa ya umu Israel: tiye ya n'ọnu-ha, ka abù a we burum ihe-àmà megide umu Israel.


N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.


ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.


Ya mere, de ihe nile i huru n'akwukwọ, ha na ihe nke nādi adi, na ihe nile nke gaje iputa mb͕e ihe ndia gasiri;


Follow us:

Advertisements


Advertisements