Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 3:23 - Bible Nso

23 N'ezie n'efu ka nzọputa ahu bu nke anēle anya ya site n'ugwu ntà di iche iche, bú ìgwè madu n'elu ugwu nile: n'ezie na Jehova, bú Chineke-ayi, ka nzọputa Israel di.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼezie, aghụghọ, ka mkpọtụ ofufe nke arụsị niile, nʼelu ugwu nta dị iche iche na nʼelu ugwu niile bụ, nʼezie, nʼime Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ka nzọpụta Izrel dị.

See the chapter Copy




Jeremaya 3:23
25 Cross References  

Jehova nwe nzọputa: Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi. Selah


N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di: Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.


Inyinya bu ihe anēdoziri ubọchi agha: Ma Jehova nwe nzọputa.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n'aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n'ezi-okwu.


Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Jehova; ọ dighi kwa onye-nzọputa di ma-ọbughi náním.


Ndi n-akpu arusi apiri api, ha nile bu ihe tọb͕ọrọ n'efu; ihe nile anāchọsi nke ha agaghi-aba urù: ndi-àmà-ha kwa, ha onwe-ha adighi-ahu uzọ, ha adighi-ama kwa; ka ihere we me ha.


N'ezie Gi onwe-gi bu Chineke Nke nēzobe Onwe-gi, Gi Chineke Israel, bú Onye-nzọputa.


Jehova ejiwo nzọputa ebighi-ebi zọputa Israel: ihere agaghi-eme unu, agaghi-etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.


N'ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n'ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.


Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n'ìhi gini ka I di ka ọbìa n'ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali?


Me ka m'diri ndu, Jehova, m'we diri ndu; zọputam, ewe zọputam: n'ihi otutom ka I bu.


ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n'akuku osisi ndu n'elu ugwu ntà ha nile di elu.


Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Werenu ọṅù tiere Jekob nkpu ọṅù, tisi-kwa-nu nkpu ike n'isi mba nile: menu ka anuru ya, tonu, si-kwa-nu, Jehova, zọputa ndi-Gi, bú Israel fọduru.


N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.


Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.


Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements