Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 3:19 - Bible Nso

19 Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “Mụ onwe m kwuru sị, “ ‘Lee ka ọ ga-esi masị m imeso unu mmeso dịka unu bụ ụmụ m ndị ikom, nye unu ala dị mma nke ga-ewetara unu ọṅụ, nke bụ ihe nketa kachasị mma na mba niile.’ Ana m eche na unu ga-akpọ m ‘Nna’ ma hapụ iwezuga onwe unu site nʼịgbaso m.

See the chapter Copy




Jeremaya 3:19
32 Cross References  

Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike, Ha ekweghi okwu-Ya;


Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ; N'ezie ihe-nketam dim ezi nma.


Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu, Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.


Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.


N'ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n'ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.


Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.


Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.


Na mb͕e ahu ka ha gākpọ Jerusalem oche-eze Jehova; agāchikọta kwa mba nile rue ya, inye aha Jehova, rue Jerusalem: ha agaghi-ejeso kwa isi-ike nke obi ọjọ ha.


Ì sighi na mb͕e a kpọkuem, si, Nnam, di m'nwere n'ab͕ọghọ ka I bu?


Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ikwa-ákwá ka ha gābia, ọ bu kwa n'aririọ-amara nile ka M'gēduru ha: M'gēme ka ha jerue iyi di iche iche juputara na miri, n'uzọ ziri ezi, nke ha nāgaghi-asu ngọngọ nime ya: n'ihi na aghọworom Israel nna, ma Efraim, ọkparam ka ọ bu.


Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n'ihi ezi ihe ahu nile na n'ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.


M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe.


n'ubọchi ahu ka M'weliri akam nye ha, ime ka ha si n'ala Ijipt puta ba n'ala nke M'ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile:


Ma onye ahu nke nābiakute ya gēme ka o si tọ ya, ọ dighi kwa onye ọ bula ganēguzo n'iru ya; ọ gēguzo kwa n'ala ahu mara nma, ngwusi gādi kwa n'aka-ya.


Ọ gābà kwa n'ala ahu mara nma, ọ di kwa ọtutu ala gāsu ngọngọ: ma ndia ka agēme ka ha wepuga onwe-ha n'aka-ya: Edom, na Moab, na ndi-isi n'umu Amon.


Ọ gāma kwa ulo-ikwū nile nke ulo uku ya n'etiti oké osimiri nile na ugwu nsọ ahu mara nma; ma ọ gābiaru ọgwugwu-ya, ọ dighi kwa onye ganēyere ya aka.


Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n'uzọ Ndida, na n'uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n'uzọ ala ahu mara nma.


M'gēsi aṅa rara gi nye, Efraim? M'gēsi aṅa nyebiga gi, Israel? M'gēsi aṅa me gi ka i di ka Adma? M'gēsi aṅa do gi ka Zeboim? obim ab͕aghariwo n'arum, obi-eberem nile di ọku n'otù.


N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus.


ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n'aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n'ọchichọ-Ya,


Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.


Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.


Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:


Follow us:

Advertisements


Advertisements