Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 29:28 - Bible Nso

28 n'ihi na o ziteworo ayi ozi na Babilon, si, Mb͕e unu gēbi n'ala ọzọ di anya: wuenu ulo, biri; kuanu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha?

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 O ziterela anyị ozi dị otu a na Babilọn sị anyị, Unu ga-anọ nʼebe ahụ tee anya. Ya mere, wuoronụ onwe unu ụlọ, birikwanụ nʼime ya. Kụọnụ ihe nʼubi, riekwanụ ihe si nʼubi unu.’ ”

See the chapter Copy




Jeremaya 29:28
3 Cross References  

Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.


Wuenu ulo, biri; kukwa-nu ihe n'ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha;


Follow us:

Advertisements


Advertisements