Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 27:8 - Bible Nso

8 O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

See the chapter Copy




Jeremaya 27:8
15 Cross References  

M'gēziga kwa mma-agha na oké unwu na ajọ ọria nēfe efe n'etiti ha, rue mb͕e agēme ka ha gwupusia n'elu ala ahu nke M'nyere ha, nye kwa ndi bu nna-ha.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M'gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n'elu ala-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.


N'ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon?


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M'tukwasiworo n'olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M'nyeworo ya.


ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon.


otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.


M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:


Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?


Follow us:

Advertisements


Advertisements