Jeremaya 27:6 - Bible Nso6 Ma ub͕u a Mu onwem enyewo ala nile ndia n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, bú orùm; ọzọ kwa, anu ọhia ka M'nyeworo ya ifè ya. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu. See the chapter |
Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.
le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.