Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 27:4 - Bible Nso

4 nye ha iwu inye ndi-nwe-ha, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi ndi-nwe-unu;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,

See the chapter Copy




Jeremaya 27:4
8 Cross References  

Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n'ọzara.


Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku.


Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu.


chiri ha zigara eze Edom, ziga-kwa-ra eze Moab, ziga-kwa-ra eze umu Amon, ziga-kwa-ra eze Taia, ziga-kwa-ra eze Zaidon, site n'aka ndi-ozi ndi nābiaru Jerusalem nābiakute Zedekaia, bú eze Juda;


Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n'elu uwa, site n'ikem di uku, site kwa n'ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n'anyam inye.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M'tukwasiworo n'olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M'nyeworo ya.


Ọ bughi dika ihe ndia ka òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements