Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 27:16 - Bible Nso

16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m'gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.

See the chapter Copy




Jeremaya 27:16
7 Cross References  

O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.


Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.


n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n'ala-unu je n'ebe di anya: ka M'we chupu kwa unu, unu ewe la n'iyì.


Ma unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efé eze Babilon: n'ihi na amuma ugha ka ha nēburu unu.


Tutu ogologo arọ abua eruzue Mu onwem ganēbulata nēbe a ihe nile nke ulo Jehova, nke Nebukadneza, bú eze Babilon, siri n'ebe a bupu, we bubà ha na Babilon:


Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements