Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 27:11 - Bible Nso

11 Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M'gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n'elu ala-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.” ’ ”

See the chapter Copy




Jeremaya 27:11
8 Cross References  

Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n'agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata.


Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m'gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu.


Otú a ka Jehova sirim: Mere onwe-gi ab͕u di iche iche na nkpọrọ di iche iche, tukwasi ha n'olu-gi;


O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.


Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gāchikọputawori ulo Israel n'etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n'etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n'anya mba nile, ha gēbi kwa n'elu ala-ha, nke M'nyere orùm, bú Jekob.


Follow us:

Advertisements


Advertisements