Jeremaya 27:10 - Bible Nso10 n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n'ala-unu je n'ebe di anya: ka M'we chupu kwa unu, unu ewe la n'iyì. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi. See the chapter |
M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.