Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 26:6 - Bible Nso

6 M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’ ”

See the chapter Copy




Jeremaya 26:6
20 Cross References  

n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Jehova, mb͕e i nuru ihe M'kwuru megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, na ha gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-nkọcha, i we dọwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.


Unu gārapu aha-unu n'azu ighọrọ ndi M'rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ:


M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha.


bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta;


M'gēji kwa mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ọria nēfe efe, chuso ha, M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, ibu ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, na ibu ihe-ita-uta, n'etiti mba nile ebe M'chugaworo ha:


agēsite kwa na ha bulie nkọcha, nke ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ ndi nọ na Babilon gēji kọcha, si, Jehova me gi ka i di ka Zedekaia na dika Ehab, ndi eze Babilon rub͕uru n'ọku:


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.


Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n'ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.


Ndi nile ndi nāgabiga n'uzọ akuwo aka megide gi; Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si: Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile?


Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo.


E, Israel nile agabigawo iwu-Gi, we wezuga onwe-ha, ka ha we ghara ige olu-Gi nti: ewe wukwasi ayi ọb͕ub͕a-ayi ahu na ọṅuṅu-ayi ahu nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, bú orù Chineke; n'ihi na ayi emehiewo megide Ya.


O we sim, Nka bu ọb͕ub͕a-iyi nke nāpùru iru ala nka nile: n'ihi na onye ọ bula nke nēzu ori ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di; ọ bu kwa onye ọ bula nke nāṅu iyi ka agēkpochapu n'ebe a dika o si di.


Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M'we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa.


Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements