Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 26:3 - Bible Nso

3 Eleghi anya ha gānu, we lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēchè ime ha n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha.

See the chapter Copy




Jeremaya 26:3
15 Cross References  

O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.


Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.


Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.


Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.


Eleghi anya ulo Juda gānu ihe ọjọ ahu nile nke Mu onwem nēchè ime ha; ka ha we lata, onye o bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we b͕aghara ajọ omume-ha na nmehie-ha.


Eleghi anya aririọ-amara-ha gāda n'iru Jehova, ha ewe lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata: n'ihi na ọ di uku, bú iwe ahu na ọnuma ahu nke Jehova kwuworo megide ndi nka.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, je biri n'ala ọzọ n'ehihie n'anya-ha; i gēsi kwa n'ọnọdu-gi je biri n'ebe ọzọ n'anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.


M'gaghi-emezu idi-ọku nke iwem, M'gaghi-alaghachi ibibi Efraim: n'ihi na Chineke ka M'bu, abughm madu; n'etiti gi ka Mu, bú Onye nsọ, nọ: M'gaghi-abata kwa n'obodo.


Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.


O we kpere Jehova, si, Biko, Jehova, Ǹka abughi okwum, mb͕e m'nānọ n'alam? N'ihi nka ka m'buru uzọ b͕alaga na Tashish: n'ihi na amaram na Gi onwe-gi bu Chineke nke bu onye-amara, onye-obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ Nke nāba kwa uba n'ebere, Nke nēchèghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu I gēweta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements