Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 25:38 - Bible Nso

38 Ọ rapuwo okwu-ọhia-Ya, dika ọdum: n'ihi na ala-ha aghọwo ihe-iju-anya site n'idi-ọku nke mma-agha nēme ihe-ike, na site n'iwe-Ya di ọku.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.

See the chapter Copy




Jeremaya 25:38
15 Cross References  

Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.


Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.


Ha aghawo ọka wheat, ma ogwu bu ihe-ubi ha wereworo; ha aghọwo ndi-ọria, ma ọ dighi-abara ha urù: ka ihere ihe-omume nile unu me kwa unu, sita n'iwe di ọku nke Jehova.


Ala nka nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe na ihe-iju-anya; mba ǹdia gēfè kwa eze Babilon ọgu arọ na iri.


Ma gi onwe-gi gēburu ha amuma okwu nile ndia, si ha Jehova gēsi n'elu bib͕ọ, si kwa n'ebe-obibi-Ya di nsọ me ka olu-Ya da udà; Ọ gēbib͕osi ebe-ita-nri-Ya ike; nkpu dika ndi nāzọcha nkpuru-vine ka Ọ gēti imegide ndi nile bi n'uwa.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebeita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka o si n'aru-ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara arọputa? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


Bipunu ọgha-nkpuru nime Babilon, ya na onye nēji mma-iwe-ihe-ubi na mb͕e owuwe-ihe-ubi: n'iru mma-agha nēme ihe-ike ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula n'ala-ya.


Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka ha si n'aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?


Jehova ka ha gējeso, dika ọdum ka Ọ gāb͕ọ uja; N'ihi na Ya onwe-ya gāb͕ọ uja, umu gesi kwa n'Ọdida-anyanwu bia nāma jijiji.


N'ihi na Mu onwem gādiri Efraim ka ọdum, di-kwa-ra ulo Juda ka nwa-ọdum: Mu onwem, ọbuná Mu Onwem gādọka, la; M'gēbupu, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.


Ma, le, mọ-ozi nke nagwām okwu nāpu, mọ-ozi ozọ nāpu kwa izute ya,


Follow us:

Advertisements


Advertisements