Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 22:13 - Bible Nso

13 Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.

See the chapter Copy




Jeremaya 22:13
16 Cross References  

Eze Ijipt we me Elaiakim, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem, gugharia ya aha Jehoiakim. Neko we were Joahaz nwa-nne-ya, me ka ọ biarue Ijipt.


Jehoiakim b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya.


Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego, Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:


Ahuhu gādiri ndi nātukwasi ulo n'ulo, ndi nēme ka ubi rue ubi nso, rue mb͕e ọnọdu adighi kwa ọzọ, ewe me ka nání unu biri n'etiti ala!


Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!


Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.


Ndi ji ọbara èwu Zaion, ji kwa ajọ omume ewu Jerusalem.


Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike!


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n'aka efu:


Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements