M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.
Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku:
Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.