Jeremaya 20:6 - Bible Nso6 Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” See the chapter |
N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.