Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 2:3 - Bible Nso

3 Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

See the chapter Copy




Jeremaya 2:3
32 Cross References  

Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.


i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n'ọlu, nke i nāgha n'ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n'ọgwugwu arọ, mb͕e i si n'ubi chikọta ihe nile i lutara n'ọlu.


Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.


Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.


Otú a ka Jehova kwuru megide ndi-ab͕ata-obi ọjọm nile, ndi nēmetu ihe-nketa ahu aka nke M'meworo ka ndim, bú Israel, keta: le, M'gaje iropu ha n'elu ala-ha, ulo Juda ka M'gēropu kwa n'etiti ha.


Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel:


N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha.


Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.


Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ.


Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n'ugwu Sameria, ndi akpọrọ n'aha n'aha n'etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo!


Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.


Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M'nyeworo ha.


Ma ọ buru na nkpuru mbu di nsọ, ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ di kwa nsọ: ọ buru kwa na nkpọrọgwu di nsọ, alaka di kwa nsọ.


kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.


dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya:


N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi, ọ bu kwa gi ka Jehova rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.


na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.


N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.


N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements