Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 2:25 - Bible Nso

25 B͕ochie ukwu-gi n'ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n'ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n'ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n'anya, ha ka m'gējeso kwa.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’

See the chapter Copy




Jeremaya 2:25
27 Cross References  

Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.


O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.


N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.


N'iba-uba nke uzọ-gi ka ike gwusiri gi; i sighi, Ntukwasi-obi adigh: ndu aka-gi ka i chọtara; n'ihi ya i riaghi ọria.


Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme?


Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.


Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.


Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.


Unu ọb͕ọ a, unu onwe-unu le Jehova. Ọ̀ bu ọzara ka M'buworo Israel? ma-ọ̀bu ala nke oké ọchichiri? gini mere ndim ji si, Ayi lupuru alupu; ayi agaghi-abiakute Gi ọzọ?


Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n'Abarim tie nkpu; n'ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n'anya.


Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.


Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n'okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.


Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua; Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya: Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya, Ha aghọworo ya ndi-iro.


Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku: Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.


ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.


ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;


N'ihi na nne-ha akwawo iko: nwanyi nke turu ime ha emewo ihe-ihere: n'ihi na ọ siri, Ka m'jeso ndi nāhum n'anya, ndi nēnyem nrim na mirim na aji-anum na flax nkem na manum na ihe-ọṅuṅum.


Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?


Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:


Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a.


N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya?


i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.


Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo, Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe.


Follow us:

Advertisements


Advertisements