Jeremaya 2:19 - Bible Nso19 Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 Ọ bụ ajọ omume unu ga-ewetara unu ahụhụ; ahụhụ soo ndaghachi azụ unu bụ ihe ga-adọ unu aka na ntị. Tulee ma matanụ nʼonwe unu otu o si bụrụ ihe ọjọọ na ihe ilu nye unu bụ inupu isi na ịgbakụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu azụ na-enweghị egwu ọbụla nʼime unu banyere m,” nke a bụ ihe Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kwupụtara. See the chapter |
ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.