Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 2:18 - Bible Nso

18 Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ugbu a, gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Ijipt sitekwa nʼịṅụ mmiri nke osimiri Naịl? Gịnị bụ uru unu nwetara site nʼịga Asịrịa, sitekwa nʼịṅụ mmiri si na Yufretis?

See the chapter Copy




Jeremaya 2:18
18 Cross References  

Na mb͕e ahu ka eze, bú Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka.


N'elu ọtutu miri ka nkpuru-ọghigha Shaihoa, nke bu owuwe-ihe-ubi nke Nail, bu ihe-omume-ya; o we ghọ urù-ahia nke mba di iche iche.


Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!


N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēji aguba nke egotara egota n'ofè nile nke Osimiri, bú eze Asiria, kọpu isi na aji ukwu: ọbuná afu-ọnu ka ọ gākọchapu kwa.


Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi.


Rùe ole mb͕e ka i ganēje iru na azu, gi ada nke nādaghachi azu? n'ihi na Jehova ekèwo ihe -ohu n'uwa, Nwanyi gānọ nwoke buruburu.


Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi: N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.


Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye, Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.


I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi.


O we nupu isi n'okpuru ya n'iziga ndi-ozi-ya n'Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya?


Agēme gi ihe ndia, n'ihi na i kwasoro mba di iche iche iko, n'ihi na i jiwo arusi nile ha rua árú.


Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.


Efraim we di ka nduru nēnweghi uche, ọ dighi obi amam-ihe o nwere: Ijipt ka ha kpọkuworo, Asiria ka ha jekuworo.


site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa,


Follow us:

Advertisements


Advertisements