Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 2:17 - Bible Nso

17 Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?

See the chapter Copy




Jeremaya 2:17
28 Cross References  

Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.


o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.


N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha, Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:


Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi, Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.


O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi.


Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.


I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.


Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu.


Ahuhu gādiri mba nmehie, ndi ajọ omume nānyib͕u, nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ, umu nke nēbibi onwe-ha: ha arapuwo Jehova, ha elelìwo Onye Nsọ nke Israel, ha aghọwo ndi ala ọzọ, laghachi azu.


njehie, na igọnari Jehova, na isi n'iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n'obi-ayi, na ikwuputa ha.


Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.


N'ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n'ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;


N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.


Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Uzọ-gi na omume-gi nile ewewo gi ihe ndia; nka bu ihe ọjọ gi; n'ihi na ọ di ilu, n'ihi na o rutuwo obi-gi aru.


n'ihi ihe ọjọ ha nke ha meworo ikpasum iwe, n'ije isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ifè chi ọzọ di iche iche, ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha, ma-ọbu unu onwe-unu, ma-ọbu nna-unu-hà.


Ajọ omume nile unu ewezugawo ihe ndia, nmehie nile unu eb͕ochiwo-kwa-ra unu ezi ihe.


Dika iru-árú-ha si di na dika njehie nile ha si di, otú a ka M'mere ha: M'we zonari ha irum.


Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.


N'ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n'ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem?


Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.


Ọ chọtara ya n'ala ọzara, Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja. Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe, Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya:


Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.


Follow us:

Advertisements


Advertisements