Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.
Fero-neko we ke ya ab͕u nime Ribla n'ala Hemat, ka o we ghara ibu eze nime Jerusalem; o we tukwasi ala ahu nra, bú ọgu talent ọla-ọcha ise, na otù talent ọla-edo.
njehie, na igọnari Jehova, na isi n'iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n'obi-ayi, na ikwuputa ha.
Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.
Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n'ala ọzọ, gi ada nēbi n'Ijipt: n'ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi.
N'okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n'etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n'isi nke umu nkpọtu.
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme kwa ka arusi nile la n'iyì, M'gēme kwa ihe-efu nile kwusi na Nof; ọ dighi kwa onye-isi gēsi n'ala Ijipt puta ọzọ: M'gētiye kwa egwu n'ala Ijipt.
N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.
Ọ we kwue ihe bayere Gad, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara: Dika nne-ọdum ka ọ nēbi, Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.