Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 2:14 - Bible Nso

14 Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n'ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n'agha?

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Izrel ọ bụ ohu, ka ọ bụ ohu a mụrụ nʼụlọ? Gịnị mere o ji ghọọ ihe nlụta nʼagha?

See the chapter Copy




Jeremaya 2:14
7 Cross References  

Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem.


Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu.


I gāsi kwa Fero, Otú a ka Jehova siri, Nwam, bú ọkparam, ka Israel bu:


ab͕ataram orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, umu-ulo di-kwa-ram; ọtutu ihe-nnweta, bú ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu, di-kwa-ram, kari ndi nile burum uzọ nime Jerusalem:


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.


Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements