Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.
Onye-amuma nke nrọ di ya n'ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n'ọnu, ya kwue okwum n'ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
M'gēsi kwa n'ebe ahu nye ya ubi-vine-ya nile, na ndagwurugwu Ekoa ibu ọnu-uzọ olile-anya: ọ gāza kwa n'ebe ahu, dika n'ubọchi nile ọ di na nwata, na dika n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.