Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 19:5 - Bible Nso

5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi Baal. Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye Baal, bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi.

See the chapter Copy




Jeremaya 19:5
14 Cross References  

Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.


O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.


Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n'ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M'nēnyeghi ha n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha;


M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na ihe di iche iche gābata n'obi-gi, i gēchè kwa èchìchè ọjọ:


gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n'uche-gi n'elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi.


Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.


Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku.


Follow us:

Advertisements


Advertisements