Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 18:10 - Bible Nso

10 ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n'anyam, we ghara ige nti n'olum, M'gēchèghari kwa n'ezi ihe ahu, nke M'siri na M'gēji me ya nma.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya.

See the chapter Copy




Jeremaya 18:10
14 Cross References  

Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere.


Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha.


Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;


ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, ndi nile nke nēlelìm anya agaghi-ahu kwa ya:


Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum.


Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.


Samuel abiaghi kwa ọzọ ihu Sọl rue ubọchi ọnwu-ya; n'ihi na Samuel nēruru Sọl újú: ma Jehova cheghariri na o mere Sọl ka ọ buru eze Israel.


N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.


Follow us:

Advertisements


Advertisements