Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 17:5 - Bible Nso

5 Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

See the chapter Copy




Jeremaya 17:5
16 Cross References  

Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia.


nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.


N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova, Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem.


Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.


Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?


Ha ewe tua ujọ, ihere gēme kwa ha, n'ihi Etiopia, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, na n'ihi Ijipt, bú ima-nma-ha.


Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.


E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.


i gāsi kwa ha, Otúaka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Onye anābu ọnu ka onye ahu bu nke nādighi-anu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a,


Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.


Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n'ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n'onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n'ikwa-iko: n'ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova.


Follow us:

Advertisements


Advertisements