Jeremaya 16:16 - Bible Nso16 Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 “Ma ugbu a, aga m ezipu ọtụtụ ndị ọkụ azụ ka ha gaa jide ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mgbe nke ahụ gasịrị, aga m ezipụkwa ọtụtụ ndị na-achụ nta, ndị ga-esite nʼelu ugwu ukwu niile na nʼelu ugwu nta niile, na nʼọnụ mgbawara dị na nkume niile, chụọ nta ha. See the chapter |
le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.