Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 16:13 - Bible Nso

13 M'gātupu kwa unu n'elu ala nka tukwasi unu n'ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n'ebe ahu ehihie na abali; n'ihi na M'gaghi-emere unu amara.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’

See the chapter Copy




Jeremaya 16:13
21 Cross References  

Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Eze we me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


M'gēropu kwa ha n'elu alam nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham, M'gēme kwa ya ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile.


M'we zilaga ha n'isi-ike nke obi-ha, Ka ha we nējeghari na ndum-ọdu nile ha.


N'ihi na otú a ka jehova siri, Le, M'gaje imapu ndi bi n'ala nka dika èbè na mb͕e a, M'gākpab͕u kwa ha, ka ha we chọputa ha.


Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n'ìhi gini ka I di ka ọbìa n'ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali?


Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa.


M'gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n'ala i nāmagh: n'ihi na amuyewo ọku n'iwem, n'aru unu ka ọ gēre.


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.


I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.


M'gētufu kwa gi na nne-gi onye muru gi, rue ala ọzọ, ebe anāmughi unu; ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gānwu.


Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi?


Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu.


Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e M'letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.


Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n'ebe ahu, bú osisi na nkume.


Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements