Ahuhu gādiri onye nāluso Onye kpuworo ya ọ̀gù! otù ejùjù nile nke ala! Urọ, ọ̀ gāsi onye nākpu ya, Gini ka i nālu? ma-ọbu ọlu-gi, ọ̀ gasi, Ọ dighi aka abua o nwere?
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Yoke nke ígwè ka M'tukwasiworo n'olu mba nile ndia, ka ha we fè Nebukadneza, bú eze Babilon; ha gēfè kwa ya: ọzọ, anu ọhia ka M'nyeworo ya.