Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 15:11 - Bible Nso

11 Jehova siri, N'ezie atọpuwom i ime ezi ihe; n'ezie emewom ka onye-iro-gi riọ gi aririọ na mb͕e ihe ọjọ na nime mb͕e nkpab͕u.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.

See the chapter Copy




Jeremaya 15:11
15 Cross References  

O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.


N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem.


Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.


Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.


Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya:


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.


Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


Follow us:

Advertisements


Advertisements