5 M'we je, zobe ya n'akuku Yufretis, dika Jehova nyerem iwu.
5 Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.
Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.
O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na Jehova sirim, Bilie, je Yufretis, weputa ihe-ọkiké ahu n'ebe ahu, bú nke M'nyere gi iwu izobe n'ebe ahu.
M'we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m'nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n'ọkpukpu nke ya.
Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus.
Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.