Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 13:23 - Bible Nso

23 Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.

See the chapter Copy




Jeremaya 13:23
13 Cross References  

Ma ha anughi, kama dika ikpé mbu ha si di ka ha onwe-ha nēme.


Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya.


Ihe nke b͕agọrọ ab͕agọ, apughi ime ka ọ dizie: ọzọ, ihe-nkọnari, apughi iguta ya.


N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


N'ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n'onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n'irum, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


Ha nākwa kwa emò, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, ma ezi-okwu ka ha nādighi-ekwu: ha ezíwo ire-ha ikwu okwu-ugha; ọ bu n'ime ajọ omume ka ike gwuru ha.


Ha we gosi Sọl, o we ziga ndi-ozi ọzọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma. Sọl we ziga kwa ndi-ozi ọzọ nke ub͕ò atọ, ha onwe-ha we bū kwa amuma.


Follow us:

Advertisements


Advertisements